Ọkammụta Chidi Igwe nwetere nzere mmụta bachelọs site na mahadum Ambrose Ali University nke dị n’Ekpoma, na Nigeria.
Dr Chidi IgweỌ hapụrụ ala Nigeria n’afọ 2003 gawa mba Canada, ebe o tuuru nzere mmụta mastas n’afọ 2005 site na mahadum University of Regina. Ka o mechara nke a, ọ banyere mahadum Dalhousie University dị na Halifax, ebe ọ gụrụ akwụkwọ maka inwete nzere ọkammụta PHD, bụ nke o nwetere n’afọ 2009.
Ọ na-akụzi nkụzi na mahadum Regina.
Ọkammụta Chidi Igwe ji ọkwa dịka ọnụ na-ekwuru ndị ICAS. Ọ bụkwazi onye nchekwa na onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ mmụta asụsụ na omenaala Igbo, nke ndị ICAS wubere na Regina.
Ori akụ ya bụ Mmaezi Lawretta Igwe. Ha ji otu nnwa, Chidera Igwe.